Aịzaya 30

bụ Ijipt, ndị inyeaka ha na-enye enweghị isi. Nʼihi nke a, ana m agụ ya Rehab, onye na-enweghị ihe ọ na-arụ.

Isaiah 30:7 (UKJV) For the Egyptians shall help in vain, and to no purpose: therefore have I cried concerning this, Their strength is to sit still.

5ihere ga-eme onye ọbụla nʼihi ndị na-abaghị uru nye ha, ndị na-abụghị ihe inyeaka maọbụ ihe iba uru, kama naanị ihe ihere na ịta ụta.”

6Amụma banyere ụmụ anụmanụ bi na Negev. Nʼala ahụhụ na mkpagbu, nke ọdụm na nne ọdụm, nke ajụala na agwọ ọjọọ na-efe ka ọkụ, ndị nnọchite anya obodo na-ebu akụ ha niile nʼelu ịnyịnya ibu, na-ebukwa akụnụba ha dị oke ọnụahịa nʼelu ịnyịnya kamel, na-agakwuru mba ahụ na-abaghị uru,

7bụ Ijipt, ndị inyeaka ha na-enye enweghị isi. Nʼihi nke a, ana m agụ ya Rehab, onye na-enweghị ihe ọ na-arụ.

8Gaa ugbu a, dekwasịrị ha ya nʼelu mbadamba nkume, detuokwa ha nʼime akwụkwọ, ka ọ dịrị maka ụbọchị na-abịa dịka ihe akaebe ruo mgbe ebighị ebi.

9Nʼihi na ndị a bụ ndị na-enupu isi, ụmụ aghụghọ ndị kpachaara anya jụ ịnabata ozizi Onyenwe anyị na-ezi.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.