Aịzaya 30

Nʼihi na ndị a bụ ndị na-enupu isi, ụmụ aghụghọ ndị kpachaara anya jụ ịnabata ozizi Onyenwe anyị na-ezi.

Isaiah 30:9 (UKJV) That this is a rebellious people, lying children, children that will not hear the law of the LORD:

7bụ Ijipt, ndị inyeaka ha na-enye enweghị isi. Nʼihi nke a, ana m agụ ya Rehab, onye na-enweghị ihe ọ na-arụ.

8Gaa ugbu a, dekwasịrị ha ya nʼelu mbadamba nkume, detuokwa ha nʼime akwụkwọ, ka ọ dịrị maka ụbọchị na-abịa dịka ihe akaebe ruo mgbe ebighị ebi.

9Nʼihi na ndị a bụ ndị na-enupu isi, ụmụ aghụghọ ndị kpachaara anya jụ ịnabata ozizi Onyenwe anyị na-ezi.

10Ha na-agwa ndị ọhụ ụzọ, “Unu ahụkwala ọhụ, o zuola,” ma sịkwa ndị amụma, “Mechienụ ọnụ! Unu ahụtakwarala anyị ihe ziri ezi nʼọhụ unu. Gwanụ anyị ihe na-atọ ụtọ na ntị, buonu amụma nduhie.

11Unu na-anọchiri anyị ụzọ, nyenụ anyị ohere. Anyị achọkwaghị ịnụ ihe ọbụla banyere onye ahụ unu na-akpọ Onye dị nsọ nke Izrel.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.