9Nʼihi na ndị a bụ ndị na-enupu isi, ụmụ aghụghọ ndị kpachaara anya jụ ịnabata ozizi Onyenwe anyị na-ezi.
10Ha na-agwa ndị ọhụ ụzọ, “Unu ahụkwala ọhụ, o zuola,” ma sịkwa ndị amụma, “Mechienụ ọnụ! Unu ahụtakwarala anyị ihe ziri ezi nʼọhụ unu. Gwanụ anyị ihe na-atọ ụtọ na ntị, buonu amụma nduhie.
11Unu na-anọchiri anyị ụzọ, nyenụ anyị ohere. Anyị achọkwaghị ịnụ ihe ọbụla banyere onye ahụ unu na-akpọ Onye dị nsọ nke Izrel.”
12Ya mere, ihe a ka Onye dị nsọ nke Izrel na-ekwu, “Nʼihi na unu kpọrọ okwu m na-agwa unu asị, ma dabere na mmegbu na-atụkwasịkwa obi unu nʼaghụghọ,
13mmehie a ga-aghọrọ unu ihe dịka mgbidi dị elu, nke gbawara agbawa, nke ga-ada na mberede, nʼotu ntabi anya.