7Amaara m nke ọma na ụbọchị ahụ na-abịa, mgbe onye ọbụla nʼime unu ga-atụfu arụsị ọlaedo na ọlaọcha niile nke aka mmehie unu kpụrụ.
8“Mgbe ahụ, Asịrịa ga-ada, kama ọ bụghị site na mma agha mmadụ, mma agha na-abụghị nke mmadụ efu ga-erichapụ ha. Ha ga-esi nʼihu mma agha gbaa ọsọ, ma ụmụ okorobịa ha ka a ga-akpụrụ tinye nʼọrụ mmanye.
9Obodo ha niile e wusiri ike ga-ada nʼihi oke egwu, ndị ọchịagha ha ga-atụkwa ụjọ mgbe ha hụrụ ọkọlọtọ agha.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya. Onye ọkụ ya dị na Zayọn, onye ekwu igwe ọkụ ya dị na Jerusalem.