8Ma onye a na-asọpụrụ na-atụpụta atụmatụ dị ezi mma, ọ na-eguzokwa chịm nye ezi ihe.
9Unu ndị inyom na-ebi ndụ ndị afọ juru, bilie ọtọ, gee m ntị; unu ndị ada ndị nwere ntụkwasị obi, nụrụnụ ihe m nwere ikwu.
10Nʼoge na-adịghị anya, mgbe otu afọ na abalị ole na ole gasịrị, unu bụ ndị nwere ntụkwasị obi ga-ama jijiji; nʼihi na mkpụrụ ubi vaịnị unu ga-emebi, owuwe mkpụrụ ihe ubi agaghị abịa.
11Maanụ jijiji, unu ndị inyom afọ juru, tụọ egwu unu ndị ada ndị nwere ntụkwasị obi. Yipụnụ uwe ọma unu, kekwasịnụ onwe unu akwa mkpe.
12Tienụ aka nʼobi nʼihi ubi unu na-enye afọ ojuju, nʼihi osisi vaịnị na-amị mkpụrụ.