17Mkpụrụ nke ezi omume ahụ ga-abụ udo; ihe ga-esikwa na ya pụta ga-abụ ị nọ jụụ na ntụkwasị obi mgbe niile ebighị ebi.
18Ndị m ga-ebi nʼebe obibi nke udo, nʼụlọ nwere ezi nchekwa, nʼebe izuike nke nsogbu na-adịghị.
19A sikwa na mkpụrụ mmiri ezoo nʼoke ọhịa niile, a sikwa na e bibie obodo niile,
20ndị a gọziri agọzi ka unu ga-abụ, mgbe unu na-agha mkpụrụ unu nʼakụkụ iyi, mgbe ehi unu na ịnyịnya ibu unu na-akpagharị na-aga ebe ọbụla ha chọrọ.