5Nʼụbọchị ahụ, a gaghị ahụkwa onye nzuzu sị na ọ bụ onye maara ihe. A gaghị enyekwa onye aghụghọ nsọpụrụ ọzọ.
6Nʼihi na ndị nzuzu na-ekwu okwu na-echeghị echiche, obi ha niile dị na-ime ajọ ihe. Ọ na-ebi ndụ asọpụrụghị Chineke, na-ekwusakwa okwu njehie megide Onyenwe anyị; ndị agụụ na-agụ ka ha na-agbaba aka ndị akpịrị na-akpọ nkụ, ha adịghị enye ha mmiri ọṅụṅụ.
7Ndị ọjọọ na-eji ụzọ aghụghọ niile eme ihe ọjọọ, ha na-echepụta nzube ajọ ihe niile, iji okwu ụgha laa onye ogbenye nʼiyi, ọ bụladị mgbe arịrịọ nke onye ahụ nọ na mkpa bụ nke ziri ezi.
8Ma onye a na-asọpụrụ na-atụpụta atụmatụ dị ezi mma, ọ na-eguzokwa chịm nye ezi ihe.
9Unu ndị inyom na-ebi ndụ ndị afọ juru, bilie ọtọ, gee m ntị; unu ndị ada ndị nwere ntụkwasị obi, nụrụnụ ihe m nwere ikwu.