10Ma Onyenwe anyị na-asị, “Ugbu a, m ga-ebili.” “Ugbu a, ka a ga-eme ka m dị elu; ugbu a, ka a ga-ebuli m elu.
11Unu na-atụ ime ahịhịa kpọrọ nkụ, unu na-amụpụta ahịhịa, nkuume unu na-ekupụta bụ ọkụ ga-erepịa unu.
12Ndị gị ga-ere ọkụ, dịka osisi ogwu e gbuturu egbutu tụnye nʼọkụ; ha ga-ere ọkụ dịka avụvụ nkwụ.”
13Geenụ ntị nụrụ ihe m mere, unu mba niile dị nʼebe dị anya! Unu ndị nọ nso, kwerenụ nʼezie na m siri ike!
14Ndị mmehie na ndị ajọ omume nọ na Zayọn na-ama jijiji nʼegwu, ha na-akwa akwa na-asị, “Onye nʼime anyị pụrụ ibi nʼebe a, nʼetiti onye a bụ ọkụ na-erepịa erepịa, ọkụ nke na-ere ruo mgbe ebighị ebi?”