Aịzaya 34

Ndị ya a na-asọpụrụ agaghị ahụkwa ihe ọbụla nʼebe ahụ nke ha ga-akpọ alaeze. Otu a kwa, ụmụ ndị eze ya niile agaghị adịkwa.

Isaiah 34:12 (UKJV) They shall call the nobles thereof to the kingdom, but none shall be there, and all her princes shall be nothing.

10Ọ gaghị anyụ anyụ nʼabalị maọbụ nʼehihie; anwụrụ ọkụ ya ga na-ala nʼelu ruo ebighị ebi. Ala ahụ ga-atọgbọrọ nʼefu site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ; ọ dịghị onye ga-esitekwa nʼebe ahụ gafee ọzọ.

11Ikwighịkwighị nke ọzara na okwolo ga-enweta ya, ikwighịkwighị ukwu na ugolọma ga-akpa akwụ ha birikwa nʼebe ahụ. Chineke ga-eseti nʼelu Edọm, eriri ọtụtụ nke ọgbaaghara, na ihe ịtụ mgbidi nke e tikpọrọ etikpọ, tọgbọrọ nʼefu.

12Ndị ya a na-asọpụrụ agaghị ahụkwa ihe ọbụla nʼebe ahụ nke ha ga-akpọ alaeze. Otu a kwa, ụmụ ndị eze ya niile agaghị adịkwa.

13Ogwu ga-etochi ụlọ ukwu ya niile; ebe ya niile e wusiri ike ga-aghọ ahịhịa ogwu, ọ ga-abụkwa ụlọ nkịta ọhịa na nke ikwighịkwighị.

14Anụ ọhịa niile nke ọzara ga-ezute nkịta ọhịa nʼebe ahụ. Ụmụ mkpi ọhịa ga-awagharị nʼebe ahụ na-ebeku ibe ha akwa. Nʼebe ahụ ka ụmụ anụ ọhịa na-akpagharị nʼabalị ga-ezo onwe ha, chọtakwara onwe ha ọnọdụ ebe izuike.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.