8Nʼihi na Onyenwe anyị nwere ụbọchị ahụ bụ ụbọchị ịbọ ọbọ. Ọ bụ afọ ịkwụghachi Edọm ihe ha mere Zayọn.
9Isi iyi ndị Edọm niile ga-agbanwe gbajie ojii, uzuzu dị nʼala ga na-ere ọkụ dịka sọlfọ (ntụ ọkụ), ala ahụ niile ga-enwuru ọkụ dị ka unyi ojii.
10Ọ gaghị anyụ anyụ nʼabalị maọbụ nʼehihie; anwụrụ ọkụ ya ga na-ala nʼelu ruo ebighị ebi. Ala ahụ ga-atọgbọrọ nʼefu site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ; ọ dịghị onye ga-esitekwa nʼebe ahụ gafee ọzọ.
11Ikwighịkwighị nke ọzara na okwolo ga-enweta ya, ikwighịkwighị ukwu na ugolọma ga-akpa akwụ ha birikwa nʼebe ahụ. Chineke ga-eseti nʼelu Edọm, eriri ọtụtụ nke ọgbaaghara, na ihe ịtụ mgbidi nke e tikpọrọ etikpọ, tọgbọrọ nʼefu.
12Ndị ya a na-asọpụrụ agaghị ahụkwa ihe ọbụla nʼebe ahụ nke ha ga-akpọ alaeze. Otu a kwa, ụmụ ndị eze ya niile agaghị adịkwa.