Aịzaya 34

Nyochaa akwụkwọ nsọ ka ị gụọ ihe Onyenwe anyị gaje ime: Ọ dịghị anụ ọhịa ọbụla ga-efu. Ọ dịghị nke ọbụla ga-anọ nʼebe ahụ hapụ ịkpọ ibe ya, nʼihi na ọnụ ya enyela iwu a. Mmụọ ya ga-achịkọtakwa ha.

Isaiah 34:16 (UKJV) Seek all of you out of the book of the LORD, and read: no one of these shall fail, none shall lack her mate: for my mouth it has commanded, and his spirit it has gathered them.

14Anụ ọhịa niile nke ọzara ga-ezute nkịta ọhịa nʼebe ahụ. Ụmụ mkpi ọhịa ga-awagharị nʼebe ahụ na-ebeku ibe ha akwa. Nʼebe ahụ ka ụmụ anụ ọhịa na-akpagharị nʼabalị ga-ezo onwe ha, chọtakwara onwe ha ọnọdụ ebe izuike.

15Ikwighịkwighị ga-akpa akwụ ya nʼebe ahụ. Ọ ga-anọkwa nʼebe ahụ yie akwa, zụọ ụmụ ya, lekọtaa ha site nʼiji nku ya kpuchie ha. Ebe ahụ kwa ka ndagbụ ga-ezukọkwa, nke ọbụla na ibe ya.

16Nyochaa akwụkwọ nsọ ka ị gụọ ihe Onyenwe anyị gaje ime: Ọ dịghị anụ ọhịa ọbụla ga-efu. Ọ dịghị nke ọbụla ga-anọ nʼebe ahụ hapụ ịkpọ ibe ya, nʼihi na ọnụ ya enyela iwu a. Mmụọ ya ga-achịkọtakwa ha.

17Ọ bụ ya onwe ya ga-ekewa ala ahụ, jiri ihe ọtụtụ nʼaka keere ha oke ahụ. Ha ga-enweta ya ruo mgbe ebighị ebi, nwekwa ebe obibi nʼebe ahụ site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.