1Bịanụ nso, unu ndị mba niile, ṅaa ntị. Geenụ ntị, unu mba niile nke ụwa. Ka ụwa na ihe niile dị nʼime ya, na ihe niile na-esi nʼime ya apụta nụrụ.
2Nʼihi na Onyenwe anyị na-eweso mba niile nke ụwa iwe, iwe ya dị ọkụ megide ndị agha ha niile. Ọ ga-ala ha nʼiyi kpamkpam, nyefee ha nʼaka ndị ga-egbu ha.
3Ndị ha e gburu egbu ka a ga-atụpụ. Ozu ha ga-esikwa isi. Ugwu niile ga-ejupụta nʼọbara ha.
4Nʼoge ahụ, kpakpando niile nke eluigwe ga-agbaze, a ga-apịakọtakwa mbara eluigwe dịka akwụkwọ, kpakpando niile ga-ada dịka ahịhịa osisi vaịnị kpọrọ nkụ, dịka mkpụrụ osisi fiig chakpọrọ achakpọ.
5Nʼihi na mma agha m arụchaala ọrụ ya nʼeluigwe, lezie anya ihe gaje ime, ọ ga-adakwasị Edọm, ndị m mara ikpe mbibi.