5Nʼihi na mma agha m arụchaala ọrụ ya nʼeluigwe, lezie anya ihe gaje ime, ọ ga-adakwasị Edọm, ndị m mara ikpe mbibi.
6Mma agha Onyenwe anyị jupụtara nʼọbara, abụba kpuchikwara ya, ọbara ụmụ atụrụ na mkpi na abụba sitere nʼakụrụ ebule nʼihi na Onyenwe anyị nwere ịchụ aja na Bozra. O nwekwara oke ogbugbu ga-adị nʼala Edọm.
7Oke ehi ọhịa ga-esokwa ha daa, ha na oke ehi ukwu na oke ehi nta. Ala ga-ejupụta nʼọbara ha. Uzuzu nke obodo ahụ ga-amịkọrọ ọbara ha.
8Nʼihi na Onyenwe anyị nwere ụbọchị ahụ bụ ụbọchị ịbọ ọbọ. Ọ bụ afọ ịkwụghachi Edọm ihe ha mere Zayọn.
9Isi iyi ndị Edọm niile ga-agbanwe gbajie ojii, uzuzu dị nʼala ga na-ere ọkụ dịka sọlfọ (ntụ ọkụ), ala ahụ niile ga-enwuru ọkụ dị ka unyi ojii.