13Mgbe ahụ, ọchịagha ahụ guzoro were oke olu kwuo nʼasụsụ Hibru, sị, “Nụrụnụ okwu niile nke eze ukwu ahụ, bụ eze Asịrịa.
14Nke a bụ ihe eze sịrị, Unu ekwela ka Hezekaya duhie unu. Ọ pụghị ịzọpụta unu.
15Unu ekwela ka Hezekaya mee ka unu tụkwasị Onyenwe anyị obi, mgbe ọ na-asị, ‘Nʼezie, Onyenwe anyị aghaghị ịnapụta anyị. A gaghị enyefe obodo a nʼaka eze Asịrịa.’
16“Unu aṅakwala Hezekaya ntị. Ihe a ka eze Asịrịa kwuru: Pụkwutenụ m, bịanụ ka mụ na unu mee udo. Mgbe ahụ, onye ọbụla nʼime unu ga-eri mkpụrụ si nʼubi vaịnị ya na nke si nʼosisi fiig ya, ṅụọkwa mmiri nke si nʼihe icheta mmiri ya:
17ruo mgbe m ga-abịa duru unu gaa nʼala dịka nke unu, bụ ala mkpụrụ ọka na nke mmanya ọhụrụ, ala achịcha na ubi vaịnị jupụtara nʼime ya.