1Nʼafọ nke iri na anọ nke ọchịchị eze Hezekaya, Senakerib, bụ eze Asịrịa, busoro obodo Juda niile e wusiri ike agha, meriekwa ha.
2Mgbe ahụ, eze Asịrịa sitere na Lakish zipụ ọchịagha ya, ya na usuu ndị agha ijekwuru Hezekaya na Jerusalem. Mgbe ọchịagha ahụ kwụsịrị nʼụzọ mmiri nke ọdọ mmiri dị Elu, nʼụzọ jere nʼebe ọhịa Ọsụ akwa.
3Eliakịm, nwa Hilkaya, onye nlekọta ụlọeze, na Shebna, bụ ode akwụkwọ eze, na Joa nwa Asaf, onye ndekọ akụkọ ihe mere, pụrụ jekwuru ya.
4Ọchịagha ahụ sịrị ha, “Gwanụ Hezekaya: “ ‘Otu a ka eze ukwu ahụ, bụ eze Asịrịa, na-ekwu, Ọ bụ na gịnị ka ntụkwasị obi gị dabere?