3Eliakịm, nwa Hilkaya, onye nlekọta ụlọeze, na Shebna, bụ ode akwụkwọ eze, na Joa nwa Asaf, onye ndekọ akụkọ ihe mere, pụrụ jekwuru ya.
4Ọchịagha ahụ sịrị ha, “Gwanụ Hezekaya: “ ‘Otu a ka eze ukwu ahụ, bụ eze Asịrịa, na-ekwu, Ọ bụ na gịnị ka ntụkwasị obi gị dabere?
5Ị na-ekwu na i nwere ndụmọdụ na ike ibu agha, maọbụ naanị egbe ọnụ ka ị na-agba. Ọ bụ onye ka ị na-atụkwasị obi, mere i ji enupu isi nʼokpuru m?
6Lee, amatara m na ị na-atụkwasị obi nʼIjipt, mkpanaka achara ahụ gbajiri agbaji, nke na-adụwa aka onye ọbụla na-adabere na ya. Otu a ka Fero, eze Ijipt dị nye ndị niile na-atụkwasị ya obi.
7Ma ọ bụrụ na unu asị m, “Anyị na-atụkwasị Onyenwe anyị bụ Chineke anyị obi.” Ọ bụghị ya ka Hezekaya wezugara ebe ya niile dị elu na ebe ịchụ aja ya niile, na-asị Juda na Jerusalem, “Unu aghaghị ịkpọ isiala nʼebe ịchụ aja a?”