5Ị na-ekwu na i nwere ndụmọdụ na ike ibu agha, maọbụ naanị egbe ọnụ ka ị na-agba. Ọ bụ onye ka ị na-atụkwasị obi, mere i ji enupu isi nʼokpuru m?
6Lee, amatara m na ị na-atụkwasị obi nʼIjipt, mkpanaka achara ahụ gbajiri agbaji, nke na-adụwa aka onye ọbụla na-adabere na ya. Otu a ka Fero, eze Ijipt dị nye ndị niile na-atụkwasị ya obi.
7Ma ọ bụrụ na unu asị m, “Anyị na-atụkwasị Onyenwe anyị bụ Chineke anyị obi.” Ọ bụghị ya ka Hezekaya wezugara ebe ya niile dị elu na ebe ịchụ aja ya niile, na-asị Juda na Jerusalem, “Unu aghaghị ịkpọ isiala nʼebe ịchụ aja a?”
8“ ‘Ma ugbu a, bịa kwee nna m ukwu, bụ eze Asịrịa nkwa. Aga m enye gị puku ịnyịnya abụọ ma ọ bụrụ na i nwere ike ịchọta ndị ga-agba ha.
9Ị ga-esi kwa aṅaa jụ otu onyeisi nke dịkarịsịrị nta nʼime ndịisi ọrụ onyenwe m, na-agbanyeghịkwa na i na-atụkwasị obi nʼIjipt maka inweta ụgbọ agha na ndị na-agba ịnyịnya?