Aịzaya 37

nke a bụ okwu Onyenwe anyị kwuru megide ya. “Nwaagbọghọ na-amaghị nwoke, bụ ada Zayọn, na-elelị gị anya, jirikwa gị na-eme ihe ọchị, Nwaada Jerusalem na-efufekwa isi ya mgbe ị na-agbapụ ọsọ.

Isaiah 37:22 (UKJV) This is the word which the LORD has spoken concerning him; The virgin, the daughter of Zion, has despised you, and laughed you to scorn; the daughter of Jerusalem has shaken her head at you.

20Ma ugbu a, Onyenwe anyị Chineke anyị, biko, zọpụta anyị site nʼaka ya, ka alaeze niile nke ụwa mata na naanị gị Onyenwe anyị bụ Chineke, na ọ dịkwaghị chi ọzọ ma ọ bụghị gị.”

21Mgbe ahụ, Aịzaya nwa Emọz, zigaara Hezekaya ozi, sị, “Otu a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel, sịrị, Nʼihi ekpere gị niile nye m banyere Senakerib, eze Asịrịa,

22nke a bụ okwu Onyenwe anyị kwuru megide ya. “Nwaagbọghọ na-amaghị nwoke, bụ ada Zayọn, na-elelị gị anya, jirikwa gị na-eme ihe ọchị, Nwaada Jerusalem na-efufekwa isi ya mgbe ị na-agbapụ ọsọ.

23Onye ka ị kparịrị ma kwulukwaa? Ọ bụ onye ka i sitere na nganga gị welie olu okwu gị na anya gị elu megide? Ọ bụ megide onye Nsọ nke Izrel?

24I sitere nʼaka ndị ozi gị kparịa Onyenwe anyị, kwuluo ya, ị sịkwara, ‘Eji m ọtụtụ ụgbọala m rigoruo ebe dị elu nke nʼelu ugwu niile, nʼebe kachasị elu nke ugwu Lebanọn. Egbudasịala m osisi sida ya niile toro ogologo, na osisi junipa ya niile kachasị mma. Ejeruola m na nsọtụ ya kachasị nʼịdị elu, bụ ebe kachasị maa mma nʼoke ọhịa ya niile.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.