21Mgbe ahụ, Aịzaya nwa Emọz, zigaara Hezekaya ozi, sị, “Otu a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel, sịrị, Nʼihi ekpere gị niile nye m banyere Senakerib, eze Asịrịa,
22nke a bụ okwu Onyenwe anyị kwuru megide ya. “Nwaagbọghọ na-amaghị nwoke, bụ ada Zayọn, na-elelị gị anya, jirikwa gị na-eme ihe ọchị, Nwaada Jerusalem na-efufekwa isi ya mgbe ị na-agbapụ ọsọ.
23Onye ka ị kparịrị ma kwulukwaa? Ọ bụ onye ka i sitere na nganga gị welie olu okwu gị na anya gị elu megide? Ọ bụ megide onye Nsọ nke Izrel?
24I sitere nʼaka ndị ozi gị kparịa Onyenwe anyị, kwuluo ya, ị sịkwara, ‘Eji m ọtụtụ ụgbọala m rigoruo ebe dị elu nke nʼelu ugwu niile, nʼebe kachasị elu nke ugwu Lebanọn. Egbudasịala m osisi sida ya niile toro ogologo, na osisi junipa ya niile kachasị mma. Ejeruola m na nsọtụ ya kachasị nʼịdị elu, bụ ebe kachasị maa mma nʼoke ọhịa ya niile.
25Egwuola m ọtụtụ olulu mmiri nʼala ndị mba ọzọ, ṅụkwa mmiri dị nʼebe ahụ. Ọ bụ ọbụ ụkwụ m ka m ji mee ka isi iyi niile dị nʼIjipt takpọọ.’