Aịzaya 40

A ga-eme ka ndagwurugwu ọbụla dị elu, ugwu ọbụla na ugwu nta ọbụla ka a ga-emekwa ka ọ dị ala, ebe niile dị mkputamkpu ka a ga-eme ka o guzo kwem, meekwa ka ebe niile dị ndakoro ndakoro dịrị larịị.

Isaiah 40:4 (UKJV) Every valley shall be exalted, and every mountain and hill shall be made low: and the crooked shall be made straight, and the rough places plain:

2Were nwayọọ gwa Jerusalem okwu, gwa ya; na ụbọchị ọjọọ ya niile agwụla, na a kwụzuola ụgwọ mmehie ya niile, na o sitela nʼaka Onyenwe anyị nata ụgwọ ọrụ karịrị okpukpu abụọ nke mmehie ya niile.

3Otu onye na-eti mkpu sị, “Dozienụ ụzọ nye Onyenwe anyị nʼime ọzara, meenụ ka ụzọ atụliri atụli guzozie kwem nʼime ọzara nye Chineke anyị.

4A ga-eme ka ndagwurugwu ọbụla dị elu, ugwu ọbụla na ugwu nta ọbụla ka a ga-emekwa ka ọ dị ala, ebe niile dị mkputamkpu ka a ga-eme ka o guzo kwem, meekwa ka ebe niile dị ndakoro ndakoro dịrị larịị.

5Nʼihi na a ga-ekpughepụ ebube Onyenwe anyị, mmadụ niile ga-ahụkọkwa ya nʼotu. Nʼihi na ọnụ Onyenwe anyị ekwuola ya.”

6Olu ahụ sịrị, “Tie mkpu!” Ma ajụrụ m sị, “Gịnị ka m ga-eti?” “Mmadụ niile dị ka ahịhịa, ikwesi ntụkwasị obi ha niile dịkwa ka okoko osisi ọhịa.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.