1Nọrọnụ jụụ nʼihu m, unu mba niile mmiri gbara gburugburu! Ka mba niile gbanwee ike ha. Ka ha pụta kwuo okwu. Ka anyị zukọtaa nʼebe ikpe ikpe.
2“Onye kpọtere onye a sitere nʼọwụwa anyanwụ na-abịa, onye e sitere nʼezi omume kpọọ ya ije ozi? O weere mba niile nyefee ya nʼaka, meriekwa ndị eze nʼihu ya. O ji mma agha ya tie ha mee ka ha ghọọ uzuzu, jiri ụta ya mee ka ha ghọọkwa igbugbo ọka nke ifufe na-ebugharị.
3Ọ na-achụ ha ọsọ, ma na-agakwa nʼihu na-enweghị mmerụ ahụ ọbụla. E, ọ na-agbasokwa ụzọ nke ọ na-agabeghị mbụ.