Aịzaya 41

“Onye kpọtere onye a sitere nʼọwụwa anyanwụ na-abịa, onye e sitere nʼezi omume kpọọ ya ije ozi? O weere mba niile nyefee ya nʼaka, meriekwa ndị eze nʼihu ya. O ji mma agha ya tie ha mee ka ha ghọọ uzuzu, jiri ụta ya mee ka ha ghọọkwa igbugbo ọka nke ifufe na-ebugharị.

Isaiah 41:2 (UKJV) Who raised up the righteous man from the east, called him to his foot, gave the nations before him, and made him rule over kings? he gave them as the dust to his sword, and as driven stubble to his bow.

1Nọrọnụ jụụ nʼihu m, unu mba niile mmiri gbara gburugburu! Ka mba niile gbanwee ike ha. Ka ha pụta kwuo okwu. Ka anyị zukọtaa nʼebe ikpe ikpe.

2“Onye kpọtere onye a sitere nʼọwụwa anyanwụ na-abịa, onye e sitere nʼezi omume kpọọ ya ije ozi? O weere mba niile nyefee ya nʼaka, meriekwa ndị eze nʼihu ya. O ji mma agha ya tie ha mee ka ha ghọọ uzuzu, jiri ụta ya mee ka ha ghọọkwa igbugbo ọka nke ifufe na-ebugharị.

3Ọ na-achụ ha ọsọ, ma na-agakwa nʼihu na-enweghị mmerụ ahụ ọbụla. E, ọ na-agbasokwa ụzọ nke ọ na-agabeghị mbụ.

4Ọ bụ onye rụrụ ọrụ dị otu a mezukwa ya, na-akpọ ọgbọ niile site na mmalite? Ọ bụ mụ onwe m, bụ Onyenwe anyị, onye dị siterị na mbido ihe niile, onye ga-adịgidekwa ruo ọgwụgwụ ihe niile. Ọ bụ mụ onwe m bụ onye ahụ.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.