Aịzaya 41

Nʼihi na mụ onwe m, bụ Onyenwe anyị Chineke gị, onye na-ejidesi aka nri gị ike bụ onye na-asị gị, ‘Atụla egwu; aga m enyere gị aka.’

Isaiah 41:13 (UKJV) For I the LORD your God will hold your right hand, saying unto you, Fear not; I will help you.

11“Lee! A ga-etinye ndị niile iwe ha dị ọkụ megide unu nʼọnọdụ ihe ihere, ihere ga-emekwa ha. Ndị niile na-eguzogide unu ga-aghọ ihe efu, bụrụ ndị lara nʼiyi.

12Unu ga-ele anya ha, chọọ ha, ma ọ dịghị onye ọbụla nʼime ha ga-afọdụ ndụ. Ndị a na-ebuso unu agha ga-abụ naanị ihe efu.

13Nʼihi na mụ onwe m, bụ Onyenwe anyị Chineke gị, onye na-ejidesi aka nri gị ike bụ onye na-asị gị, ‘Atụla egwu; aga m enyere gị aka.’

14Atụla egwu, gị idide, bụ Jekọb, unu Izrel dị nta, atụla egwu, nʼihi na mụ onwe m ga-enyere gị aka,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, Onye mgbapụta gị, bụ Onye nsọ nke Izrel.

15“Lee, aga m eme ka unu ghọọ igwe ọhụrụ eji azọcha mkpụrụ ọka nke dị nkọ, nwekwa ọtụtụ eze. Unu ga-azọcha ugwu niile zọpịa ha, meekwa ka ugwu nta niile dịka igbugbo ọka.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.