9Esitere m na nsọtụ niile nke ụwa kpọghachi unu, gwa unu na ohu m ka unu bụ, nʼihi na ahọpụtala m unu, agakwaghị m ahapụ unu.
10Ya mere, unu atụla egwu nʼihi na anọnyeere m unu. Ka obi ghara ịlọ unu mmiri nʼihi na abụ m Chineke unu. Aga m eme ka unu dịrị ike; aga m enyere unu aka; aga m ejikwa aka nri nke ezi omume m kwagide unu.
11“Lee! A ga-etinye ndị niile iwe ha dị ọkụ megide unu nʼọnọdụ ihe ihere, ihere ga-emekwa ha. Ndị niile na-eguzogide unu ga-aghọ ihe efu, bụrụ ndị lara nʼiyi.
12Unu ga-ele anya ha, chọọ ha, ma ọ dịghị onye ọbụla nʼime ha ga-afọdụ ndụ. Ndị a na-ebuso unu agha ga-abụ naanị ihe efu.
13Nʼihi na mụ onwe m, bụ Onyenwe anyị Chineke gị, onye na-ejidesi aka nri gị ike bụ onye na-asị gị, ‘Atụla egwu; aga m enyere gị aka.’