Aịzaya 41

Esitere m na nsọtụ niile nke ụwa kpọghachi unu, gwa unu na ohu m ka unu bụ, nʼihi na ahọpụtala m unu, agakwaghị m ahapụ unu.

Isaiah 41:9 (UKJV) You whom I have taken from the ends of the earth, and called you from the chief men thereof, and said unto you, You are my servant; I have chosen you, and not cast you away.

7Onye ọkpụ ụzụ ọla na-agba onye ọkpụ ụzụ ọlaedo ume. Onye ji mkpirisi igwe eme ka ihe dị mụrụmụrụ, na-agba onye na-akụ osiama ume. Otu onye na-ekwu banyere nkpukọta ya, na-asị, “A kpụziri ya akpụzi.” Onye nke ọzọ, na-eji ǹtu kpọgidesie ihe ahụ apịrị apị ike ka ọ ghara ịda.

8“Ma gị onwe gị, Izrel, ohu m, Jekọb, onye m họpụtara, gị mkpụrụ Ebraham, bụ enyi m.

9Esitere m na nsọtụ niile nke ụwa kpọghachi unu, gwa unu na ohu m ka unu bụ, nʼihi na ahọpụtala m unu, agakwaghị m ahapụ unu.

10Ya mere, unu atụla egwu nʼihi na anọnyeere m unu. Ka obi ghara ịlọ unu mmiri nʼihi na abụ m Chineke unu. Aga m eme ka unu dịrị ike; aga m enyere unu aka; aga m ejikwa aka nri nke ezi omume m kwagide unu.

11“Lee! A ga-etinye ndị niile iwe ha dị ọkụ megide unu nʼọnọdụ ihe ihere, ihere ga-emekwa ha. Ndị niile na-eguzogide unu ga-aghọ ihe efu, bụrụ ndị lara nʼiyi.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.