Aịzaya 41

Onye ọkpụ ụzụ ọla na-agba onye ọkpụ ụzụ ọlaedo ume. Onye ji mkpirisi igwe eme ka ihe dị mụrụmụrụ, na-agba onye na-akụ osiama ume. Otu onye na-ekwu banyere nkpukọta ya, na-asị, “A kpụziri ya akpụzi.” Onye nke ọzọ, na-eji ǹtu kpọgidesie ihe ahụ apịrị apị ike ka ọ ghara ịda.

Isaiah 41:7 (UKJV) So the carpenter encouraged the goldsmith, and he that smoothes with the hammer him that stroke the anvil, saying, It is ready for the soldering: and he fastened it with nails, that it should not be moved.

5Mba niile bi nʼala mmiri gbara gburugburu ahụla ọrụ m rụrụ. Ha hụrụ ya tụọ egwu; ndị niile bi na nsọtụ ụwa na-amakwa jijiji. Ha zukọtara bịa nso.

6Onye ọbụla nʼime ha na-agba ibe ya ume na-asị, “Nwee obi ike.”

7Onye ọkpụ ụzụ ọla na-agba onye ọkpụ ụzụ ọlaedo ume. Onye ji mkpirisi igwe eme ka ihe dị mụrụmụrụ, na-agba onye na-akụ osiama ume. Otu onye na-ekwu banyere nkpukọta ya, na-asị, “A kpụziri ya akpụzi.” Onye nke ọzọ, na-eji ǹtu kpọgidesie ihe ahụ apịrị apị ike ka ọ ghara ịda.

8“Ma gị onwe gị, Izrel, ohu m, Jekọb, onye m họpụtara, gị mkpụrụ Ebraham, bụ enyi m.

9Esitere m na nsọtụ niile nke ụwa kpọghachi unu, gwa unu na ohu m ka unu bụ, nʼihi na ahọpụtala m unu, agakwaghị m ahapụ unu.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.