23gwa anyị ihe ọdịnihu ji, ka anyị mara na unu bụ chi. Meenụ ezi ihe, maọbụ ihe ọjọọ, nke ga-eme ka anya gbagwojuo anyị, ka anyị jupụtakwa nʼegwu.
24Ma unu dị nta karịa ihe efu. Ọrụ unu niile bụkwa ihe na-abaghị uru. Onye họọrọ unu emeela onwe ya ihe arụ.
25“Akpọliela m otu onye site nʼakụkụ ugwu, ọ na-abịakwa. Otu onye na-asọpụrụ aha m sikwa nʼọwụwa anyanwụ. Ọ na-azọpịa ndị ọchịchị niile dịka ha bụ ụrọ, ọ ga-azọpịa ha dịka onye na-akpụ ite si azọpịa aja ụrọ.
26O kwuru maka nke a site na mmalite, ka anyị nwee ike mara, maọbụ mgbe na o mebeghị, ka anyị nwee ike sị, ‘Ihe o kwuru ziri ezi’? O nweghị onye kwuru ihe banyere nke a, o nweghịkwa onye mere ka amata ya, o nwekwaghị onye si nʼọnụ gị nụ okwu ọbụla.
27Abụ m onye mbụ gwara Zayọn, ‘Lee, nʼebe a ka ha dị!’ Ọ bụ m ziteere Jerusalem onyeozi oziọma.