26O kwuru maka nke a site na mmalite, ka anyị nwee ike mara, maọbụ mgbe na o mebeghị, ka anyị nwee ike sị, ‘Ihe o kwuru ziri ezi’? O nweghị onye kwuru ihe banyere nke a, o nweghịkwa onye mere ka amata ya, o nwekwaghị onye si nʼọnụ gị nụ okwu ọbụla.
27Abụ m onye mbụ gwara Zayọn, ‘Lee, nʼebe a ka ha dị!’ Ọ bụ m ziteere Jerusalem onyeozi oziọma.
28Elegharịrị m anya ma o nweghị onye m hụrụ. O nweghị onye nọ nʼetiti chi ha nke nwere ike inye ndụmọdụ; o nweghị onye inye ọsịsa ajụjụ mgbe m jụrụ ha.
29Lee, ha niile bụ ụgha! Ọrụ ha niile pụtara ihe efu, arụsị ha niile awuru awu bụ naanị ifufe na ọgbaaghara.