12Ka ha nye Onyenwe anyị ebube, kpọsaakwa otuto ya nʼala niile mmiri gbara gburugburu.
13Onyenwe anyị ga-apụta buo agha dịka dike. Ọ bụ site nʼịnụ ọkụ nʼobi nke onye agha ka ọ ga-eji buo agha. Ọ ga-eti mkpu agha megide ndị iro ya, ma merie ha.
14“Ọ dịla anya kemgbe m gbara nkịtị; ejidesịrị m onwe m aka ike. Ma ugbu a, aga m egosi iwe m; aga m asụ ude, kwaa akwa dị ka nwanyị ime na-eme.
15Aga m eme ka ugwu ukwu na ugwu nta niile dị larịị, meekwa ka ihe ọkụkụ ha niile kpọnwụọ. Aga m eme ka osimiri ghọọ ọzara, meekwa ka ọdọ mmiri niile takpọọ.
16Aga m edu ndị kpuru ìsì, site nʼụzọ nke ha na-amaghị, nʼokporoụzọ ha agatụbeghị ka m ga-edu ha; Aga m eme ka ọchịchịrị ghọọ ìhè nʼihu ha, meekwa ka ebe niile gbagọrọ agbagọ guzozie. Ihe ndị a niile ka m ga-eme. Agaghị m agbakụta ha azụ.