16Aga m edu ndị kpuru ìsì, site nʼụzọ nke ha na-amaghị, nʼokporoụzọ ha agatụbeghị ka m ga-edu ha; Aga m eme ka ọchịchịrị ghọọ ìhè nʼihu ha, meekwa ka ebe niile gbagọrọ agbagọ guzozie. Ihe ndị a niile ka m ga-eme. Agaghị m agbakụta ha azụ.
17Ma ndị niile na-atụkwasị arụsị obi, ndị na-asị ihe ndị ahụ a pịrị apị, ‘Unu bụ chi anyị,’ a ga-achụghachi ha azụ nʼọnọdụ ihere.
18“Geenụ ntị, unu ndị ntị chiri, leenụ anya unu ndị ìsì kpuru, ma hụ ụzọ.
19Olee onye kpuru ìsì dịka ohu m? Onye kwa ka ntị chiri dịka onyeozi nke eziokwu m? Ọ dị onye ọzọ kpuru ìsì dịka onye a m họpụtara ka ọ bụrụ ohu Onyenwe anyị?
20Ị hụla ọtụtụ ihe, ma ị dịghị atụkwasị uche gị na ha. Ntị gị ghere oghe, ma ị dịghị eji ya anụ ihe.”