20Ị hụla ọtụtụ ihe, ma ị dịghị atụkwasị uche gị na ha. Ntị gị ghere oghe, ma ị dịghị eji ya anụ ihe.”
21Onyenwe anyị emeela ka iwu ya dị ukwuu, meekwa ka ọ dị ebube, nʼihi na ọ tọrọ ya ụtọ isite na ya mee ka ezi omume ya pụta ìhè.
22Ma e meela ka ndị ya bụrụ ndị e zukpọrọ ihe ha nwere nʼoge agha. A kpọchikwara ha nʼolulu e gwuru nʼala, zoo ha nʼime ụlọ mkpọrọ dị iche iche. Ha aghọọla ihe a kwatara nʼagha, ma ọ dịghị onye na-anapụta ha. Ha aghọkwaala ihe e si nʼaka mmadụ pụnara ya nʼike, ma ọ dịghị onye na-asị ndị iro ha, “Nyeghachikwa m ihe m i ji aka ike were.”
23Onye ka ọ bụ nʼetiti unu nke ga-ege ntị nʼihe ndị a? Onye ga-aṅa ntị si otu a mata ihe na-aga ime nʼoge dị nʼihu?
24Onye weere Jekọb nyefee nʼaka ndị na-ebibi ihe, onye were Izrel nyefee ndị ohi? Ọ bụ na ọ bụghị Onyenwe anyị onye ha mehiere megide? Nʼihi na ha ekweghị eso ụzọ ya niile, ha erubeghị isi nye iwu ya.