Aịzaya 42

Onye ka ọ bụ nʼetiti unu nke ga-ege ntị nʼihe ndị a? Onye ga-aṅa ntị si otu a mata ihe na-aga ime nʼoge dị nʼihu?

Isaiah 42:23 (UKJV) Who among you will give ear to this? who will hearken and hear for the time to come?

21Onyenwe anyị emeela ka iwu ya dị ukwuu, meekwa ka ọ dị ebube, nʼihi na ọ tọrọ ya ụtọ isite na ya mee ka ezi omume ya pụta ìhè.

22Ma e meela ka ndị ya bụrụ ndị e zukpọrọ ihe ha nwere nʼoge agha. A kpọchikwara ha nʼolulu e gwuru nʼala, zoo ha nʼime ụlọ mkpọrọ dị iche iche. Ha aghọọla ihe a kwatara nʼagha, ma ọ dịghị onye na-anapụta ha. Ha aghọkwaala ihe e si nʼaka mmadụ pụnara ya nʼike, ma ọ dịghị onye na-asị ndị iro ha, “Nyeghachikwa m ihe m i ji aka ike were.”

23Onye ka ọ bụ nʼetiti unu nke ga-ege ntị nʼihe ndị a? Onye ga-aṅa ntị si otu a mata ihe na-aga ime nʼoge dị nʼihu?

24Onye weere Jekọb nyefee nʼaka ndị na-ebibi ihe, onye were Izrel nyefee ndị ohi? Ọ bụ na ọ bụghị Onyenwe anyị onye ha mehiere megide? Nʼihi na ha ekweghị eso ụzọ ya niile, ha erubeghị isi nye iwu ya.

25Ọ bụ ya mere o ji wụkwasị ndị ya iwe ọkụ ya, ihe ike nke agha. Ọ bụ ezie na iwe ya bịakwasịrị ha dịka ọkụ na-erepịa erepịa, ma ha aghọtaghị ihe kpatara ya; o repịara ha, ma ha atụgharịa uche ha banyere ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.