Aịzaya 43

Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, Onye nsọ gị, onye kere Izrel, Eze unu.”

Isaiah 43:15 (UKJV) I am the LORD, your Holy One, the creator of Israel, your King.

13“E, site nʼebighị ebi ruo nʼebighị ebi, mụ onwe m bụ Chineke. Ọ dịghị onye pụrụ ịnapụta m ihe m ji nʼaka. Mgbe m rụrụ ọrụ, onye pụrụ ịgbanwe ya?”

14Nke a bụ ihe Onyenwe anyị kwuru, Onye mgbapụta unu na Onye nsọ nke Izrel. “Nʼihi unu, aga m eziga ozi na Babilọn budata ndị Kaldịa niile dịka ndị gbapụrụ agbapụ, nʼime ụgbọ mmiri ahụ niile ha ji anya isi.

15Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, Onye nsọ gị, onye kere Izrel, Eze unu.”

16Otu a ka Onyenwe anyị kwuru, bụ onye ahụ kwara ụzọ nʼime osimiri, nke mere ka okporoụzọ dịrị nʼime oke osimiri.

17Nke na-eme ka ụgbọ ndị agha dị ukwuu, na ịnyịnya pụta, ndị agha na ụsụ ha achịkọtara ọnụ, mee ha ka ha dinaa nʼebe ahụ, ghara ibilitekwa ọzọ, dịka ha bụ ọkụ ogho oriọna e menyụrụ emenyụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.