Aịzaya 43

Mgbe ị si na mmiri dị omimi na-agafe, aga m anọnyere gị. Mgbe i si na mmiri nke na-ekwo oke okwukwo, agaghị m ekwe ka o bufuo gị. Mgbe ị na-eje ije nʼime ọkụ, ọ gaghị eregbu gị. Ire ọkụ ahụ agakwaghị erepịa gị.

Isaiah 43:2 (UKJV) When you pass through the waters, I will be with you; and through the rivers, they shall not overflow you: when you walk through the fire, you shall not be burned; neither shall the flame kindle upon you.

1Ma ugbu a, nke a bụ ihe Onyenwe anyị kwuru, bụ onye kere gị, Jekọb, na onye kpụrụ gị Izrel, “Atụla egwu, nʼihi na agbapụtala m gị. Akpọọla m gị aha, ị bụkwa nke m.

2Mgbe ị si na mmiri dị omimi na-agafe, aga m anọnyere gị. Mgbe i si na mmiri nke na-ekwo oke okwukwo, agaghị m ekwe ka o bufuo gị. Mgbe ị na-eje ije nʼime ọkụ, ọ gaghị eregbu gị. Ire ọkụ ahụ agakwaghị erepịa gị.

3Nʼihi na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke gị, Onye nzọpụta gị, na Onye nsọ nke Izrel. Ewerela m Ijipt na Kush na Seba nye ka ha bụrụ ihe i ji gbara onwe gị.

4Ebe ị bụ ihe dị oke ọnụahịa nʼanya m, ebe ọ bụkwa na m hụrụ gị nʼanya, aga m ewere ndị mmadụ nye nʼihi ịgbapụta gị. Aga m ebibi ndụ ndị mmadụ nʼihi ichebe gị ndụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.