18“Chefuonu ihe ndị ahụ niile mere nʼoge gara aga; unu atụgharịkwala uche unu na ha.
19Kama leenụ anya ihe ọhụrụ nke m na-aga ime. Leenụ ya nʼihi na o bidolarị ịpụta ihe. Ọ ga-abụ na unu adịghị ahụ ya? Nʼihi na ana m akwa okporoụzọ nʼọzara, na-emekwa ka mmiri jupụta nʼala tọgbọrọ nʼefu.
20Anụ ọhịa niile na-asọpụrụ m, nkịta ọhịa, na enyi nnụnụ niile na-ekele m, nʼihi na emeela m ka mmiri jupụta nʼọzara, meekwa ka isi iyi na-asọ nʼala ebe tọgbọrọ nʼefu, nye ndị nke m ihe ọṅụṅụ, bụ ndị m họpụtara.
21Ndị m kpụrụ nye onwe m, ka ha kọsaa akụkọ otuto m.
22“Ma unu akpọkughị m, Jekọb, kama ihe banyere m agwụla gị ike, Izrel.