Aịzaya 43

Ndị m kpụrụ nye onwe m, ka ha kọsaa akụkọ otuto m.

Isaiah 43:21 (UKJV) This people have I formed for myself; they shall show forth my praise.

19Kama leenụ anya ihe ọhụrụ nke m na-aga ime. Leenụ ya nʼihi na o bidolarị ịpụta ihe. Ọ ga-abụ na unu adịghị ahụ ya? Nʼihi na ana m akwa okporoụzọ nʼọzara, na-emekwa ka mmiri jupụta nʼala tọgbọrọ nʼefu.

20Anụ ọhịa niile na-asọpụrụ m, nkịta ọhịa, na enyi nnụnụ niile na-ekele m, nʼihi na emeela m ka mmiri jupụta nʼọzara, meekwa ka isi iyi na-asọ nʼala ebe tọgbọrọ nʼefu, nye ndị nke m ihe ọṅụṅụ, bụ ndị m họpụtara.

21Ndị m kpụrụ nye onwe m, ka ha kọsaa akụkọ otuto m.

22“Ma unu akpọkughị m, Jekọb, kama ihe banyere m agwụla gị ike, Izrel.

23I kpụrụghị atụrụ wetara m maka aja nsure ọkụ, maọbụ jiri aja niile sọpụrụ m. O nweghị mgbe m kwagidere gị ka i wetara m onyinye mkpụrụ ọka, maọbụ mee ka ike gwụ gị site nʼịna gị ụda na-esi isi ụtọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.