26Chetara m ihe gara aga, ka anyị rụrịta ụka nʼetiti onwe anyị, doo okwu gị nʼusoro igosi na ị bụ onye ikpe na-amaghị.
27Site na mmalite, nna nna unu ha mehiere megide m. Ndị m dunyere ka ha kuziere unu ihe nupukwara isi megide m.
28Ya mere, m ji menye ndị a maara aha ha nʼụlọnsọ ihere. Enyefere m Jekọb ka ọ bụrụ onye ewezugara nye mbibi, nyekwa Izrel ka ọ bụrụ ihe mkparị.