1“Ma ugbu a, gee ntị gị Jekọb, bụ ohu m, geekwanụ ntị, unu ndị Izrel m họpụtara.
2Nke a bụ ihe Onyenwe anyị na-ekwu, bụ onye kere unu, onye kpụrụ unu nʼime nʼafọ, na onye ga-enyere unu aka: Atụla egwu, gị Jekọb, ohu m, atụkwala egwu gị Jeshurun, onye nke m họpụtara.
3Nʼihi na aga m eme ka ala ahụ kpọrọ nkụ nweta mmiri, mee ka mmiri na-asọgharị nʼala ahụ akpịrị na-akpọ nkụ. Aga m awụkwasị ụmụ ụmụ unu Mmụọ m, meekwa ka ngọzị m dịrị ha.