Aịzaya 44

Ọ baghị uru mmadụ ịkpụrụ onwe ya arụsị maọbụ chi a pịrị apị, nke na-apụghị inyere ya aka nʼụzọ ọbụla?

Isaiah 44:10 (UKJV) Who has formed a god, or molten a graven image that is profitable for nothing?

8Unu atụla egwu. Unu amakwala jijiji. Ọ bụ na m akọpụtaghị ihe ndị a ma kwupụta ha nʼoge gara aga. Unu onwe unu bụ ndị akaebe m. Ọ dị chi ọzọ dị ma e wezuga m? Mba! O nweghị Oke nkume ọzọ dị, nke m maara ihe banyere ya.”

9Ndị a niile na-apị arụsị bụ ndị nzuzu. Chi ndị ahụ niile ha na-agụ dị ka ihe ukwu bụkwa ihe na-enweghị isi. Ndị niile na-akpọ isiala nye chi ndị a bụ ndị kpuru ìsì, na ndị amamihe kọrọ, ndị ihere ga-emekwa.

10Ọ baghị uru mmadụ ịkpụrụ onwe ya arụsị maọbụ chi a pịrị apị, nke na-apụghị inyere ya aka nʼụzọ ọbụla?

11Lee ihere ga-eme ndị niile na-akpọ isiala nye ya. Ndị kpụrụ ha bụ naanị ndị mmadụ. Ka ha niile chịkọta onwe ha, guzo, nwee mkpebi ha, ha ga-anọ nʼọnọdụ nʼihere, na nʼoke egwu.

12Ọkpụ ụzụ na-ewere ngwa ọrụ ya na-ahụ ya nʼime icheku ọkụ, ọ na-eji mkpirisi igwe onye ọka tipịa ya nʼụdịdị arụsị, ọ bụ ike nke ogwe aka ya ka o ji akpụ ụzụ. Agụ na-agụ ya, ike na-agwụsịkwa ya; ọ ṅụghị mmiri ọbụla, ọ na-adakwa mba.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.