7Ọ bụkwa onye dị ka m? Ya kwupụta ya. Ya kwupụta ya, doo ya nʼusoro ka ntị nụrụ! Ya kwupụta ihe niile mere kemgbe m mere ka ndị m guzosie ike. Ya kwupụtakwa, ma dokwaa ha nʼusoro, ihe niile na-aga ime nʼoge dị nʼihu.
8Unu atụla egwu. Unu amakwala jijiji. Ọ bụ na m akọpụtaghị ihe ndị a ma kwupụta ha nʼoge gara aga. Unu onwe unu bụ ndị akaebe m. Ọ dị chi ọzọ dị ma e wezuga m? Mba! O nweghị Oke nkume ọzọ dị, nke m maara ihe banyere ya.”
9Ndị a niile na-apị arụsị bụ ndị nzuzu. Chi ndị ahụ niile ha na-agụ dị ka ihe ukwu bụkwa ihe na-enweghị isi. Ndị niile na-akpọ isiala nye chi ndị a bụ ndị kpuru ìsì, na ndị amamihe kọrọ, ndị ihere ga-emekwa.
10Ọ baghị uru mmadụ ịkpụrụ onwe ya arụsị maọbụ chi a pịrị apị, nke na-apụghị inyere ya aka nʼụzọ ọbụla?
11Lee ihere ga-eme ndị niile na-akpọ isiala nye ya. Ndị kpụrụ ha bụ naanị ndị mmadụ. Ka ha niile chịkọta onwe ha, guzo, nwee mkpebi ha, ha ga-anọ nʼọnọdụ nʼihere, na nʼoke egwu.