17Ihe fọdụrụ nʼime osisi ahụ ka ọ na-ewere kwaara onwe ya arụsị a pịrị apị; Ọ na-ada nʼala nʼihu ya, fee ya ofufe. Ọ na-ekpekwara ya ekpere na-asị, “Biko, Zọpụta m, nʼihi na chi m ka ị bụ!”
18Ha amaghị ihe ọbụla; ha adịghị aghọtakwa, nʼihi na-emechiela anya ha ka ha ghara ịhụ ụzọ, mechiekwa uche ha, ka ha ghara ịghọta.
19Ọ dịghị onye na-anọdụ chee echiche, ọ dịghịkwa onye nwere ihe ọmụma maọbụ nghọta ị sị, “Ụfọdụ nʼime osisi a ka m ji kwanye ọkụ, Ọ bụladị ghee achịcha nʼelu icheku ọkụ ya, ejikwa m ụfọdụ nʼime ya hụọ anụ m tara. M ga-esite na nke fọdụrụ mepụta ihe rụrụ arụ? Ọ bụ ogwe osisi ka m ga-akpọ isiala nye?”
20Onye na-adịghị eche ụdị echiche a bụ onye nzuzu, nke na-eji ntụ si nʼebe a kwanyere ọkụ na-azụ onwe ya. Ọ pụghị ịnapụta onwe ya, maọbụ jụọ onwe ya ajụjụ sị, “Ihe a m ji nʼaka m, nke m na-akpọ chi, ọ bụghị okwu ụgha ka ọ bụ?”
21“Cheta ihe ndị a, gị Jekọb, nʼihi na gị bụ Izrel, ị bụ ohu m. Ọ bụ m kpụrụ gị, ị bụ ohu m; gị bụ Izrel, agaghị m echezọ gị.