Aịzaya 44

Ihe fọdụrụ nʼime osisi ahụ ka ọ na-ewere kwaara onwe ya arụsị a pịrị apị; Ọ na-ada nʼala nʼihu ya, fee ya ofufe. Ọ na-ekpekwara ya ekpere na-asị, “Biko, Zọpụta m, nʼihi na chi m ka ị bụ!”

Isaiah 44:17 (UKJV) And the residue thereof he makes a god, even his graven image: he falls down unto it, and worships it, and prays unto it, and says, Deliver me; for you are my god.

15Ọ bụkwa nkụ ka eji ya e mere; ụfọdụ ka ọ na-ewere nya ọkụ, ọ na-eji ya afụnwu ọkụ ghee achịcha. Sitekwa na ya pịa chi, kpuo ihu nʼala nye ya; ọ na-emekwa arụsị apịrị apị, kpọọ isiala nye ya.

16Ọkara nʼime osisi ndị a ka o ji emenwu ọkụ; nʼelu ya kwa ka ọ na-esi nri ya, ọ na-ahụnye anụ, were tajuo afọ ya. Nkụ ahụ ka o ji anya ọkụ na-asị, “Ahaa, ahụ ekpola m ọkụ; ahụla m ọkụ.”

17Ihe fọdụrụ nʼime osisi ahụ ka ọ na-ewere kwaara onwe ya arụsị a pịrị apị; Ọ na-ada nʼala nʼihu ya, fee ya ofufe. Ọ na-ekpekwara ya ekpere na-asị, “Biko, Zọpụta m, nʼihi na chi m ka ị bụ!”

18Ha amaghị ihe ọbụla; ha adịghị aghọtakwa, nʼihi na-emechiela anya ha ka ha ghara ịhụ ụzọ, mechiekwa uche ha, ka ha ghara ịghọta.

19Ọ dịghị onye na-anọdụ chee echiche, ọ dịghịkwa onye nwere ihe ọmụma maọbụ nghọta ị sị, “Ụfọdụ nʼime osisi a ka m ji kwanye ọkụ, Ọ bụladị ghee achịcha nʼelu icheku ọkụ ya, ejikwa m ụfọdụ nʼime ya hụọ anụ m tara. M ga-esite na nke fọdụrụ mepụta ihe rụrụ arụ? Ọ bụ ogwe osisi ka m ga-akpọ isiala nye?”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.