Aịzaya 44

Ọ bụkwa nkụ ka eji ya e mere; ụfọdụ ka ọ na-ewere nya ọkụ, ọ na-eji ya afụnwu ọkụ ghee achịcha. Sitekwa na ya pịa chi, kpuo ihu nʼala nye ya; ọ na-emekwa arụsị apịrị apị, kpọọ isiala nye ya.

Isaiah 44:15 (UKJV) Then shall it be for a man to burn: for he will take thereof, and warm himself; yea, he kindles it, and bakes bread; yea, he makes a god, and worships it; he makes it a graven image, and falls down thereto.

13Onye ọka osisi na-esite nʼeriri ọtụtụ tụpụta osisi were pensụlụ kaa ya; ọ na-ewere ngwa ọrụ ya kpụchaa osisi ahụ, were ngwa ọrụ ịka akara, kaa ya akara. Ọ na-arụ ya dịka oyiyi mmadụ, oyiyi mmadụ nʼịma mma ya niile, maka ibi nʼime ụlọ arụsị.

14Ọ na-egbutu osisi sida dị iche iche, maọbụ osisi saipres ma ọ bụkwa osisi ook. Ọ na-ahapụ ya ka o too nʼetiti osisi dị iche iche nke oke ọhịa, maọbụ kụọ osisi fịa, nke mmiri ozuzo na-eme ka o too nke ọma.

15Ọ bụkwa nkụ ka eji ya e mere; ụfọdụ ka ọ na-ewere nya ọkụ, ọ na-eji ya afụnwu ọkụ ghee achịcha. Sitekwa na ya pịa chi, kpuo ihu nʼala nye ya; ọ na-emekwa arụsị apịrị apị, kpọọ isiala nye ya.

16Ọkara nʼime osisi ndị a ka o ji emenwu ọkụ; nʼelu ya kwa ka ọ na-esi nri ya, ọ na-ahụnye anụ, were tajuo afọ ya. Nkụ ahụ ka o ji anya ọkụ na-asị, “Ahaa, ahụ ekpola m ọkụ; ahụla m ọkụ.”

17Ihe fọdụrụ nʼime osisi ahụ ka ọ na-ewere kwaara onwe ya arụsị a pịrị apị; Ọ na-ada nʼala nʼihu ya, fee ya ofufe. Ọ na-ekpekwara ya ekpere na-asị, “Biko, Zọpụta m, nʼihi na chi m ka ị bụ!”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.