Aịzaya 45

Ahụhụ na-adịrị nwantakịrị ahụ gwara nna ya okwu sị, ‘Gịnị ka ị mụtara na nwa?’ maọbụ sịkwa nne ya, ‘Gịnị bụ ihe ị mụpụtara?’

Isaiah 45:10 (UKJV) Woe unto him that says unto his father, What brought forth you? or to the woman, What have you brought forth?

8“Gị, eluigwe, zodata ezi omume m ka mbara eluigwe na-ezodakwa ya dịka mmiri. Ka ala meghee onwe ya, ka nzọpụta pupụta, ka ezi omume soro ya puokwa dịka ahịhịa. Ọ bụ mụ onwe m, bụ Onyenwe anyị kere ha niile.

9“Ahụhụ na-adịrị mmadụ ahụ nke na-alụso onye kere ya ọgụ, mmadụ ahụ bụ otu mpekele ejuju nʼetiti mpekele ejuju niile dị nʼala. Ụrọ ọ na-ajụ onye ji ya akpụ ihe ajụjụ sị, ‘Gịnị ka i ji m akpụ?’ Ka ọrụ gị ọ ga-asị, ‘Lee, ọ dịghị aka abụọ o nwere’?

10Ahụhụ na-adịrị nwantakịrị ahụ gwara nna ya okwu sị, ‘Gịnị ka ị mụtara na nwa?’ maọbụ sịkwa nne ya, ‘Gịnị bụ ihe ị mụpụtara?’

11“Otu a ka Onyenwe anyị, Onye nsọ nke Izrel, Onye kere Izrel na-ajụ ajụjụ sị; banyere ihe ndị gaje ime ị na-ajụ m ajụjụ banyere ụmụ m, maọbụ nye m iwu banyere ọrụ aka m?

12Ọ bụ mụ onwe m kere ụwa, keekwa mmadụ ka o biri nʼime ya. Aka m abụọ ka m ji gbasaa mbara igwe, nyekwa kpakpando niile iwu.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.