9“Ahụhụ na-adịrị mmadụ ahụ nke na-alụso onye kere ya ọgụ, mmadụ ahụ bụ otu mpekele ejuju nʼetiti mpekele ejuju niile dị nʼala. Ụrọ ọ na-ajụ onye ji ya akpụ ihe ajụjụ sị, ‘Gịnị ka i ji m akpụ?’ Ka ọrụ gị ọ ga-asị, ‘Lee, ọ dịghị aka abụọ o nwere’?
10Ahụhụ na-adịrị nwantakịrị ahụ gwara nna ya okwu sị, ‘Gịnị ka ị mụtara na nwa?’ maọbụ sịkwa nne ya, ‘Gịnị bụ ihe ị mụpụtara?’
11“Otu a ka Onyenwe anyị, Onye nsọ nke Izrel, Onye kere Izrel na-ajụ ajụjụ sị; banyere ihe ndị gaje ime ị na-ajụ m ajụjụ banyere ụmụ m, maọbụ nye m iwu banyere ọrụ aka m?
12Ọ bụ mụ onwe m kere ụwa, keekwa mmadụ ka o biri nʼime ya. Aka m abụọ ka m ji gbasaa mbara igwe, nyekwa kpakpando niile iwu.
13M ga-akpọlite Sairọs nʼezi omume m: M ga-eme ka ụzọ ya niile zie ezi. Ọ ga-ewughachi obodo m, mee ka ndị m a dọtara nʼagha nwere onwe ha, ma ọ bụghị nʼihi ọnụahịa maọbụ ihe nrite, ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru.”