Aịzaya 45

M ga-akpọlite Sairọs nʼezi omume m: M ga-eme ka ụzọ ya niile zie ezi. Ọ ga-ewughachi obodo m, mee ka ndị m a dọtara nʼagha nwere onwe ha, ma ọ bụghị nʼihi ọnụahịa maọbụ ihe nrite, ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru.”

Isaiah 45:13 (UKJV) I have raised him up in righteousness, and I will direct all his ways: he shall build my city, and he shall let go my captives, not for price nor reward, says the LORD of hosts.

11“Otu a ka Onyenwe anyị, Onye nsọ nke Izrel, Onye kere Izrel na-ajụ ajụjụ sị; banyere ihe ndị gaje ime ị na-ajụ m ajụjụ banyere ụmụ m, maọbụ nye m iwu banyere ọrụ aka m?

12Ọ bụ mụ onwe m kere ụwa, keekwa mmadụ ka o biri nʼime ya. Aka m abụọ ka m ji gbasaa mbara igwe, nyekwa kpakpando niile iwu.

13M ga-akpọlite Sairọs nʼezi omume m: M ga-eme ka ụzọ ya niile zie ezi. Ọ ga-ewughachi obodo m, mee ka ndị m a dọtara nʼagha nwere onwe ha, ma ọ bụghị nʼihi ọnụahịa maọbụ ihe nrite, ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru.”

14Otu a ka Onyenwe anyị sịrị, “Ihe ndị Ijipt rụpụtara na ngwa ahịa ndị Kush na ndị Saba ahụ toro ogologo, ha ga-abịakwute gị, ha ga-abụ nke gị; ha ga-esokwa gị nʼazụ dịka ndị mkpọrọ e kere agbụ. Ha ga-akpọ isiala nʼihu gị rịọ gị arịrịọ, na-asị, ‘Nʼezie, ọ bụ naanị otu Chineke dị, onye nọnyere gị, ọ dịkwaghị chi ọzọ dị.’ ”

15Nʼezie, gị onwe gị bụ Chineke, Onye nzọpụta Izrel. Ị bụkwa Chineke, onye na-ezonarị mmadụ onwe ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.