Aịzaya 45

Nʼezie, gị onwe gị bụ Chineke, Onye nzọpụta Izrel. Ị bụkwa Chineke, onye na-ezonarị mmadụ onwe ya.

Isaiah 45:15 (UKJV) Verily you are a God that hide yourself, O God of Israel, the Saviour.

13M ga-akpọlite Sairọs nʼezi omume m: M ga-eme ka ụzọ ya niile zie ezi. Ọ ga-ewughachi obodo m, mee ka ndị m a dọtara nʼagha nwere onwe ha, ma ọ bụghị nʼihi ọnụahịa maọbụ ihe nrite, ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru.”

14Otu a ka Onyenwe anyị sịrị, “Ihe ndị Ijipt rụpụtara na ngwa ahịa ndị Kush na ndị Saba ahụ toro ogologo, ha ga-abịakwute gị, ha ga-abụ nke gị; ha ga-esokwa gị nʼazụ dịka ndị mkpọrọ e kere agbụ. Ha ga-akpọ isiala nʼihu gị rịọ gị arịrịọ, na-asị, ‘Nʼezie, ọ bụ naanị otu Chineke dị, onye nọnyere gị, ọ dịkwaghị chi ọzọ dị.’ ”

15Nʼezie, gị onwe gị bụ Chineke, Onye nzọpụta Izrel. Ị bụkwa Chineke, onye na-ezonarị mmadụ onwe ya.

16A ga-eme ndị niile na-akpụ arụsị ihe ihere, e, ihere ga-eme ha nʼihi na a ga-etinye ha nʼọnọdụ oke ihere.

17Ma Onyenwe anyị ga-eji nzọpụta nke ga-adị ruo mgbe ebighị ebi zọpụta Izrel. Ihere agaghị eme ha. A gaghị etinyekwa ha nʼọnọdụ ihe ihere ruo mgbe ebighị ebi.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.