15Nʼezie, gị onwe gị bụ Chineke, Onye nzọpụta Izrel. Ị bụkwa Chineke, onye na-ezonarị mmadụ onwe ya.
16A ga-eme ndị niile na-akpụ arụsị ihe ihere, e, ihere ga-eme ha nʼihi na a ga-etinye ha nʼọnọdụ oke ihere.
17Ma Onyenwe anyị ga-eji nzọpụta nke ga-adị ruo mgbe ebighị ebi zọpụta Izrel. Ihere agaghị eme ha. A gaghị etinyekwa ha nʼọnọdụ ihe ihere ruo mgbe ebighị ebi.
18Nʼihi na otu a ka Onyenwe anyị onye kere eluigwe sịrị, ọ bụ ya dobekwara ihe niile nʼọnọdụ ha. Ọ bụ ya, bụ Chineke, onye zubere ma kee ụwa, tọkwaa ntọala ya. O keghị ụwa ka ọ tọgbọrọ nʼefu, kama ọ bụ ka e biri nʼime ya ka o ji kee ya. Ọ sịrị, “Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị; ọ dịkwaghị Chineke ọzọ dị.
19Ọ bụghị na nzuzo ka m kwuru okwu, site nʼotu ebe nʼala nke ọchịchịrị. Agwaghị m mkpụrụ Jekọb ‘Chọọnụ m nʼefu.’ Mụ onwe m, bụ Onyenwe anyị na-ekwu eziokwu, Ana m ekwupụta ihe ziri ezi.