Aịzaya 45

Nʼihi na otu a ka Onyenwe anyị onye kere eluigwe sịrị, ọ bụ ya dobekwara ihe niile nʼọnọdụ ha. Ọ bụ ya, bụ Chineke, onye zubere ma kee ụwa, tọkwaa ntọala ya. O keghị ụwa ka ọ tọgbọrọ nʼefu, kama ọ bụ ka e biri nʼime ya ka o ji kee ya. Ọ sịrị, “Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị; ọ dịkwaghị Chineke ọzọ dị.

Isaiah 45:18 (UKJV) For thus says the LORD that created the heavens; God himself that formed the earth and made it; he has established it, he created it not in vain, he formed it to be inhabited: I am the LORD; and there is none else.

16A ga-eme ndị niile na-akpụ arụsị ihe ihere, e, ihere ga-eme ha nʼihi na a ga-etinye ha nʼọnọdụ oke ihere.

17Ma Onyenwe anyị ga-eji nzọpụta nke ga-adị ruo mgbe ebighị ebi zọpụta Izrel. Ihere agaghị eme ha. A gaghị etinyekwa ha nʼọnọdụ ihe ihere ruo mgbe ebighị ebi.

18Nʼihi na otu a ka Onyenwe anyị onye kere eluigwe sịrị, ọ bụ ya dobekwara ihe niile nʼọnọdụ ha. Ọ bụ ya, bụ Chineke, onye zubere ma kee ụwa, tọkwaa ntọala ya. O keghị ụwa ka ọ tọgbọrọ nʼefu, kama ọ bụ ka e biri nʼime ya ka o ji kee ya. Ọ sịrị, “Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị; ọ dịkwaghị Chineke ọzọ dị.

19Ọ bụghị na nzuzo ka m kwuru okwu, site nʼotu ebe nʼala nke ọchịchịrị. Agwaghị m mkpụrụ Jekọb ‘Chọọnụ m nʼefu.’ Mụ onwe m, bụ Onyenwe anyị na-ekwu eziokwu, Ana m ekwupụta ihe ziri ezi.

20“Chịkọtaanụ onwe unu, gbakọtanụ, bịanụ nso, unu ndị si na mba niile gbapụta ọsọ ndụ. Ha amaghị ihe bụ ndị a na-ebugharị chi osisi e ji aka mee, ndị na-ekpekwara chi ndị ahụ na-enweghị ike ịzọpụta ekpere.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.