1“Nke a ka Onyenwe anyị na-ekwu nye ohu ya nke o tere mmanụ, bụ Sairọs, onye m ga-eji aka nri ya megide mba niile, mee ka ha nọrọ nʼokpuru ya, napụkwa ndị eze ngwa agha ha niile, megheere ya ọnụ ụzọ niile nke na ọ dịkwaghị ọnụ ụzọ ama a ga-emechibido ya.
2Mụ onwe m ga-ebu ụzọ gaa nʼihu gị kwazee ugwu ukwu niile, tiwasịa ibo ọnụ ụzọ bronz niile gbuwakwaa mkpọrọ igwe dị iche iche.
3Aga m enye gị akụ niile e zoro nʼebe ọchịchịrị gbara, akụnụba niile e zoro nʼebe nzuzo dị iche iche. Ka ị mata na ọ bụ mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, bụ Chineke nke Izrel, onye ahụ kpọrọ gị aha, na-eme ihe ndị a niile.
4Nʼihi Jekọb bụ ohu m, nʼihi Izrel onye m họpụtara nye onwe m, ka m ji kpọọ gị aha gị nyekwa gị aha nke nsọpụrụ, maọbụ ezie na ị maghị onye m bụ.